Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike. Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume. Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa. Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam. Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé: Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.
Gụọ ILU 8
Geere nke a ntị ILU 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 8:14-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo