Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu. Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile: Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya: N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
Gụọ ILU 3
Geere nke a ntị ILU 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 3:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo