ILU 3:1-12
ILU 3:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume. Sọpụrụ ONYENWE ANYị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
ILU 3:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu. Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile: Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya: N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.