Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 3

3
1Nwam, echezọla iwum;
Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:
2N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,
Na udo, ka ha gātukwasiri gi.
3Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:
Ke ha n'olu-gi;
De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:
4Chọta kwa amara na ezi uche
N'anya Chineke na madu.
5Tukwasi Jehova obi-gi nile,
Adabere-kwa-la nghọta-gi:
6N'uzọ-gi nile mara Ya,
Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.
7Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi;
Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:
8Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,
Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.
9Sọpuru Jehova site n'àkù-gi,
Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:
10Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,
Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.
11Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:
Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:
12N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;
Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
13Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,
Ya na madu nke nēnweputa nghọta.
14N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,
Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.
15Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:
Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.
16Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;
N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.
17Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,
Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.
18Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:
E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.
19Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;
O doziri elu-igwe site na nghọta.
20Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,
Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.
21Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;
Chebe nzube-ihe na ìzùzù;
22Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,
Bu-kwa-ra olu-gi amara.
23Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,
I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,
24Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:
E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
25Atula egwu site n'oké egwu mberede,
Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:
26N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,
Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.
27Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,
Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.
28Asila madu-ibe-gi, Je, lata,
Echi ka m'gēnye gi;
Mb͕e ọ di n'aka-gi.
29Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,
Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.
30Gi na madu esela okwu n'efu,
Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.
31Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,
Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.
32N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:
Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.
33Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;
Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.
34Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,
Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.
35Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;
Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara