Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ. Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu. Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya, Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha. Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha, Ihe ewe putara onye nānucha ọla: Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze, Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume. Asọpurula onwe-gi n'iru eze, Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku: N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a; Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya, Onye anya-gi abua huworo. Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere. Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi, Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ: Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi, Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi. Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu. Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe. Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya; Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata. Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi Ka onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.
Gụọ ILU 25
Geere nke a ntị ILU 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 25:1-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo