Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 25:1-14

ILU 25:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ. Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu. Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta. Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere; wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume. Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ, ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere? Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru, ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ. Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha. Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya. Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi. Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.