Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 16

16
1Madu nwe ido obi n'usoro:
Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.
2Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya:
Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.
3Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru,
Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.
4Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya:
E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.
5Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:
Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:
Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
7Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,
Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
8Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume,
Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.
9Obi madu nēchè uzọ-ya:
Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
10Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:
Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.
11Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:
Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.
12Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:
N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.
13Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;
Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.
14Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:
Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.
15N'ìhè iru eze ka ndu di;
Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.
16Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!
Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!
17Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha:
Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
18N'iru ntipia ka npako nāga,
Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.
19Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala,
Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.
20Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe:
Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
21Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta:
Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.
22Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ:
Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.
23Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche,
Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.
24Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu,
Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.
25Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,
Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
26Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu;
N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.
27Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ:
Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.
28Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu:
Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.
29Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà,
Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.
30Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu,
Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.
31Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu,
N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.
32Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike:
Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.
33Anēfe nzà,
Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 16: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara