Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 15

15
1Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu:
Ma okwu nwuta nākpali iwe.
2Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma:
Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.
3N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di,
Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.
4Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu:
Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.
5Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya:
Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.
6N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di:
Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.
7Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:
Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.
8Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova:
Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.
9Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:
Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.
10Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:
Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.
11Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova?
Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?
12Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba:
Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.
13Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma:
Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.
14Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma:
Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.
15Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ:
Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.
16Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova,
Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.
17Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu,
Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.
18Onye-ọnuma nākpali ise-okwu:
Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.
19Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu:
Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.
20Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:
Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.
21Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù:
Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.
22Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh:
Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.
23Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya:
Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!
24Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ,
Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.
25Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:
Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.
26Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu:
Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.
27Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu:
Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.
28Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu:
Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.
29Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ:
Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.
30Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria:
Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.
31Nti nke nānu iba-nba nke ndu,
N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.
32Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya:
Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.
33Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe;
Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara