Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 15

15
1Mb͕e ahu ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ siri na Jerusalem biakute Jisus, si, 2N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n'ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe? n'ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri. 3Ma Ọ zara, si ha, N'ìhi gini ka unu onwe-unu nējehie kwa n'ihe Chineke nyere n'iwu n'ihi ozizí enyere unu n'aka? 4N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu. 5Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu ihe enyere Chineke; 6ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe. 7Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,
8Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha;
Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
9Ma ha nēbirim isi ala n'efu,
Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.
10O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu: 11Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu. 12Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu? 13Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi. 14Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù. 15Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a. 16O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a? 17Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n'ọnu nāga n'afọ, ewe nyupu ya n'ulo-ǹsí? 18Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu. 19N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa: 20ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.
21Jisus we si n'ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n'akuku Taia na Saidon. 22Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike. 23Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu. 24Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel. 25Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka. 26Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita. 27Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha. 28Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu.
29Jisus we si n'ebe ahu pua bia n'usọ osimiri Galili; O we rigo n'ugwu ahu, we nọdu n'ebe ahu. 30Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike: 31ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel.
32Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya. 33Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n'ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ? 34Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole. 35O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala; 36O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. 37Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru. 38Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka. 39Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n'ub͕ọ ahu, bia n'ókè-ala Magadan.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MATIU 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye