Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 14

14
1N'oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus, 2o we si ndi nējere ya ozi, Nwoke a bu Jọn Baptist; o siwo na ndi nwuru anwu bilie; n'ihi nka ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya. 3N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya. 4N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye. 5Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n'ihi na ha guru ya n'onye-amuma. 6Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ. 7N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ. 8Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a. 9O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya; 10o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ. 11Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya. 12Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus.
13Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala. 14O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike. 15Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri. 16Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. 17Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua. 18O we si, Chita ha n'ebe a nyem. 19O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. 20Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru. 21Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.
22Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile. 23Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu. 24Ma ub͕ọ ahu di n'etiti oké osimiri ub͕u a, ebili-miri nēmekpa kwa ya aru; n'ihi na ifufe nēfegide ya. 25Ma na nche nke-anọ n'abali Ọ biakutere ha, nēje ije n'elu oké osimiri. 26Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù. 27Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu. 28Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri. 29Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus. 30Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam. 31Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua? 32Mb͕e ha rigoro n'ub͕ọ, ifufe we febìe. 33Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie.
34Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala, rue Genesaret. 35Mb͕e ndikom ebe ahu mazuru Ya, ha we ziga n'ala ahu dum di buruburu, kutara Ya madu nile aru nādighi nma; 36ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka, nání ya: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MATIU 14: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara