Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi. Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari. Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu. Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n'onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n'osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem. Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya. Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku. Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.
Gụọ JỌN 15
Geere nke a ntị JỌN 15
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 15:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị