Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 48

48
1O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim. 2Otù onye we gosi Jekob, si, Le, nwa-gi Josef nābiakute gi: Israel we jisie ike, nọdu n'elu ihe-ndina-ya. 3Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem, 4sim, Le, M'nēme gi ka i mua ọmùmù, M'gēme kwa gi ka i ba uba, M'gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M'gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi. 5Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere. 6Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha. 7Ma mu onwem, mb͕e m'siri na Padan bia, Rechel nwuru n'akukum n'ala Kenean n'uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m'we lìe ya n'ebe ahu n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem). 8Israel we hu umu-ndikom Josef, ọ si Òle ndi bu ndia? 9Josef we si nna-ya, Umum ka ha bu, ndi Chineke nyeworom n'ebe a. Ọ si, Biko, chitaram ha, m'gāgọzi ha. 10Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha. 11Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi. 12Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala. 13Josef we chiri ha abua, Efraim n'aka-nri-ya n'ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n'aka-ekpe-ya n'ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso. 14Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara. 15Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n'iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa, 16Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa. 17Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n'isi Efraim, ọ we jọ njọ n'anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n'isi Efraim tiye n'isi Manase. 18Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya. 19Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile. 20Ọ we gọzie ha n'ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n'iru Manase. 21Israel we si Josef, Le, mu onwem gaje inwu: ma Chineke gānọyere unu, me kwa ka unu lata n'ala nna-unu-hà. 22Mu onwem enyewo kwa gi otù akuku ugwu kari umu-nne-gi, nke m'ji mma-agham, ji kwa utam, nara n'aka ndi-Amorait.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 48: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye