Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 47

47
1Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n'ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n'ala Goshen. 2O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero. 3Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà. 4Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen. 5Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi: 6ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere. 7Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero. 8Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole? 9Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha. 10Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua. 11Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu. 12Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.
13Nri adighi n'ala ahu nile; n'ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n'ihi oké unwu ahu. 14Josef we chikọta ego nile anāchọta n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, n'ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n'ulo Fero. 15Ego we gwu-chapu n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n'ihi gini ka ayi nānwu n'iru gi? n'ihi na ego agwuwo. 16Josef we si, Nyenu anu-ulo-unu; ka m'nye kwa unu nri n'ọnọdu anu-ulo-unu, ma ọ buru na ego agwu. 17Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n'ọnọdu inyinya-ha, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n'ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n'arọ ahu n'ọnọdu anu-ulo-ha nile. 18Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n'arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n'iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi: 19n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù. 20Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere. 21Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ. 22Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n'ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n'ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n'ihi nka ha ereghi ala-ha. 23Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n'ala. 24O gēru kwa, n'ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n'uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n'ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri. 25Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n'iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù. 26Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere. 27Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.
28Jekob we di ndu n'ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa. 29Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt: 30kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n'Ijipt bupum, lìkwam n'ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di. 31Ọ si, Ṅuaram iyi: o we ṅuara ya iyi. Israel we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 47: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye