Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 11

11
1Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M'gēme ka ọ bia n'aru Fero na n'aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n'ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n'ebe a. 2Biko, kwue na nti ndim, ka ha riọ kwa, nwoke ọ bula n'aka nwoke-ibe-ya na nwayi ọ bula n'aka nwayi-ibe-ya, ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo. 3Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt. Ọzọ, nwoke ahu, bú Moses, di uku ri nne n'ala Ijipt, n'anya ndi-orù Fero, na n'anya ndi ahu.
4Moses we si, Otú a ka Jehova siri, Dika n'etiti abali Mu onwem ganāpu je n'etiti Ijipt: 5umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n'oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n'azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu. 6Oké iti-nkpu gādi kwa n'ala Ijipt nile, nke iti-nkpu dika ya akādighi, iti-nkpu dika ya agaghi-adi kwa ọzọ. 7Ma imegide umu Israel nile nkita agaghi-araghari ire-ya, imegide madu ma-ọbu anumanu: ka unu we mara na Jehova nākpa ókè n'etiti ndi Ijipt na Israel. 8Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n'ukwu-gi: emesia m'gāpu. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua n'iwe di ọku.
9Jehova we si Moses, Fero agaghi-ege unu nti: ka ihe-ebubem we di ọtutu n'ala Ijipt. 10Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n'iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n'ala-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye