Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 10

10
1Jehova we si Moses, Bakuru Fero: n'ihi na Mu onwem emewo ka obi-ya na obi ndi-orù-ya di arọ́, ka M'we tiye ihe-iriba-ama ndia n'etiti ha: 2ka i we kọ kwa na nti nwa-gi na nwa nwa-gi akukọ bayere emò M'kwara ndi Ijipt, na ihe-iriba-ama nile nke M'tiyere n'etiti ha; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova. 3Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm. 4N'ihi na, ma ọ buru na i nāju izipu ndim, le, echi ka M'gaje ime ka igurube bata n'ókè-ala-gi: 5ha gēkpuchi kwa iru ala, madu agaghi-enwe kwa ike ihu ala anya: ha gēri kwa ihe fọduru nke ihe arapuworo, nke fọduru unu site n'ákú-miri-ígwé, ha gēri kwa osisi nile ọ bula nke nēpuru unu epú site n'ọhia: 6ulo-gi nile na ulo ndi-orù-gi nile na ulo ndi Ijipt nile gējuputa kwa; nke nna-gi-hà na nna nile nke nna-gi-hà nāhughi, site n'ubọchi ha nọ n'elu ala rue ta. Ọ we chigharia, si n'ebe Fero nọ pua. 7Ndi-orù Fero we si ya, Rùe ole mb͕e ka nwoke a gāburu ayi ọnyà? zipu ndikom ahu, ka ha we fè Jehova, bú Chineke-ha: ì kāmaghi na Ijipt alawo n'iyì? 8Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje? 9Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere. 10Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m'gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n'ihi na ihe ọjọ di n'iru unu. 11Ọ gaghi-ndi otú a: biko, jenu, unu, bú ndikom, fè Jehova; n'ihi na nke ahu ka unu onwe-unu nāchọ. Ewe chupu ha n'iru Fero.
12Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n'elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru. 13Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube. 14Igurube we rigota n'elu ala Ijipt nile, be n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a. 15Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile. 16Fero we me ngwa ikpọ Moses na Eron, si, Eme-hiewom megide Jehova, bú Chineke-unu, megide kwa unu. 17Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a. 18Ọ we si n'ebe Fero nọ pua, riọ Jehova aririọ. 19Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt. 20Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.
21Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka. 22Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ; 23ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha. 24Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je. 25Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n'aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe. 26Ọzọ kwa, anu-ulo-ayi gēso ayi je; agaghi-arapu otù ukwu anu; n'ihi na ufọdu nime ha ka ayi gēwere fè Jehova, bú Chineke-ayi; ma ayi onwe-ayi amaghi ihe ayi gēji fè Jehova, rue mb͕e ayi gābia rue ebe ahu. 27Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o kweghi kwa izipu ha. 28Fero we si ya, Pua n'arum la, lezie onwe-gi anya, ahula irum ọzọ; n'ihi na n'ubọchi i huru irum ka i gānwu. 29Moses we si, Nke-ọma ka i kwuworo; m'gaghi-ahu kwa iru-gi ọzọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye