Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI TESALỌNAIKA 3

3
1Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n'etiti unu; 2ka ewe dọputa kwa ayi n'aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n'ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe. 3Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu. 4Ma ayi atukwasiwo obi n'aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n'iwu. 5Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n'ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.
6Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n'aka-ha idebe nke ha natara n'aka-ayi. 7N'ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n'etiti unu; 8ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu: 9ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi. 10N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe. 11N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha. 12Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha. 13Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma. 14Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru. 15Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.
16Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.
17Ekele nke mu Pọl nke m'ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n'akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m'nēde. 18Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI TESALỌNAIKA 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye