Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 8

8
1Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa. 2Nwayi ahu we bilie, me dika okwu onye nke Chineke si di: ọ we je, ya onwe-ya na ulo-ya, nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia arọ asa. 3O rue, n'ọgwugwu arọ asa ahu, na nwayi ahu si n'ala ndi Filistia lata: ọ pua itiku eze nkpu bayere ulo-ya na ala-ya. 4Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo. 5O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ. 6Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n'ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a.
7Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n'ebe a. 8Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka? 9Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka? 10Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m'hu na ọ ghaghi inwu. 11Ọ we legide ya anya, che ya iru, rue mb͕e ihere mere ya: onye nke Chineke we kwa ákwá. 12Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ. 13Hazael we si, Ma gini bu orù-gi, bú nkita nka, na ọ gēme ihe uku a? Elaisha we si, Jehova emewo ka m'hu na i gābu eze Siria. 14O we si n'ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu. 15O rue, n'echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n'iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n'ọnọdu ya.
16Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze. 17Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ astọ na Jerusalem. 18Ọ je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 19Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n'ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile. 20N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze. 21Joram we gabiga rue Zaia, ya na ub͕ọ-ala-ya nile: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala: ndi ahu we b͕alaga n'ulo-ikwū-ha. 22Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta. Mb͕e ahu ka Libna jehiere n'otù mb͕e ahu. 23Ma okwu Joram nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 24Joram we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
25N'arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze. 26Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel. 27O we je ije n'uzọ ulo Ehab, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na nwa nwa ulo Ehab ka ọ bu. 28O we soro Joram nwa Ehab ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram. 29Eze, bú Joram, we lata ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u ndi Siria tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Joram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye