Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 7

7
1Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n'ọnu-uzọ-ama Sameria. 2Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n'aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.
3Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n'oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n'ebe a rue mb͕e ayi nwuru? 4Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n'obodo, oké unwu di kwa n'obodo, ayi gānwu kwa n'ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n'ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa. 5Ha we bilie n'ururuchi, ibà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu. 6N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi. 7Ha we bilie, b͕alaga n'ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n'ihi ndu-ha. 8Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n'otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n'ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n'ulo-ikwū ọzọ, si n'ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha. 9Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze. 10Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di. 11O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime. 12Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha. 13Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi:) ka ayi ziga hu kwa. 14Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu. 15Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n'uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n'ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze. 16Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n'agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di. 17Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n'aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya. 18O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n'ọnu-uzọ-ama Sameria; 19onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya: 20o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 7: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye