Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 20

20
1Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu. 2O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si, 3Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku. 4O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n'etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si, 5Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova. 6M'gātukwasi kwa arọ iri na ise n'ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n'ihi Onwem na n'ihi Devid, bú orùm. 7Aisaia we si, Werenu mbadamba fig. Ha we were ya tukwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, o we diri ndu. 8Hezekaia we si Aisaia, Gini gābu ihe-iriba-ama na Jehova gēme ka arum di ike, m'we rigorue ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ? 9Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n'iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri? 10Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. 11Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz.
12Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n'ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria. 13Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu. 14Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si bia, bú Babilon. 15Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nēmeghi ka ha hu. 16Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova. 17Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri. 18Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulo uku eze Babilon. 19Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, Ọ̀ bughi otú a, ma ọ buru na udo na ezi-okwu adi n'ubọchim nile? 20Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n'obodo, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 21Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye