Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 19

19
1O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova. 2O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz. 3Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha. 4Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo. 5Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia. 6Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum. 7Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; M'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya.
8Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n'ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije. 9O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si, 10Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria. 11Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi? 12Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa? 13Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva? 14Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova. 15Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa. 16Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke o jiri zite ya ita Chineke di ndu uta. 17N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka mba nile na ala nile ha tọb͕ọrọ n'efu, 18ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku, n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'ihì. 19Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.
20Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú, a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya. 21Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion, elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi. 22Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel. 23I siri n'aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya. 24Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri ala ọzọ, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia. 25Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ub͕u a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu. 26Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ọka chanwuru achanwu tutu o tolite. 27Ma amawom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem. 28N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia. 29Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpu n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-atọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha. 30Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu. 31N'ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n'ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka. 32N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a kwa otú àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya. 33N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 34M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.
35O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu. 36Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve. 37O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 19: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye