Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 31

31
1Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha. 2Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova. 3O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova. 4O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova. 5Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba. 6Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo. 7N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha. 8Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel. 9Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu. 10Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a. 11Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie. 12Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua. 13Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n'okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n'otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta. 14Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile. 15Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku: 16nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di; 17na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha; 18na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n'ihi na n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n'idi-nsọ: 19umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n'ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n'obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n'aha n'aha, inye ndikom nile n'etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n'akwụkwọ-osuso-ọmumu n'etiti ndi Livai. 20Hezekaia we me otú a nime Juda nile; o we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n'iru Jehova, bú Chineke-ya. 21Ma n'ọlu ọ bula nke ọ malitere n'òfùfè nke ulo Chineke, na n'iwu, na n'ihe nile enyere n'iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 31: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye