Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 30

30
1Hezekaia we zigara Israel na Juda nile ozi, ọzọ kwa, o degara Efraim na Manase akwukwọ-ozi, ka ha biarue ulo Jehova nime Jerusalem, imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga. 2Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n'ọnwa nke-abua. 3N'ihi na ha apughi ime ya na mb͕e ahu, n'ihi na ndi-nchu-àjà adoghi onwe-ha nsọ n'ọnu-ọgugu nke gēzuru ihe ahu, ndi Israel achikọtaghi kwa onwe-ha biarue Jerusalem. 4Ihe a ziri ezi n'anya eze ma n'anya nkpọkọta Israel nile. 5Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga. 6Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria. 7Unu adi-kwa-la ka nna-unu-hà, na dika umu-nne-unu, ndi mekpuru emekpu megide Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, O we rara ha nye ibu ihe-iju-anya, dika unu onwe-unu nāhu. 8Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia. 9N'ihi na asi na unu alaghachikute Jehova, agēnwe obi-ebere n'aru umu-nne-unu na umu-unu n'iru ndi adọtara ha n'agha, ha gābiaghachi kwa n'ala nka: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gaghi-esi kwa n'ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya. 10Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya. 11Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem. 12Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n'iwu site n'okwu Jehova. 13Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem ime ememe achicha ekoghi-eko n'ọnwa nke-abua, bú nkpọkọta bara uba nke-uku. 14Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron. 15Ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova. 16Ha we guzo n'ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n'aka ndi Livai. 17N'ihi na ha bara uba nime nkpọkọta ahu, bú ndi nēdoghi onwe-ha nsọ: ndi Livai we buru ndi-isi n'ib͕uru onye ọ bula nādighi ọcha anu ngabiga, ido ha nsọ nye Jehova. 18N'ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n'Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n'akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya, 19bú onye doziworo obi-ya ichọ Chineke, bú Jehova, Chineke nke nna-ya-hà, ọ bu ezie na emeghi ka ọ di ọcha dika ime-ka-adi-ọcha nke ebe nsọ ayi si di. 20Jehova we ge Hezekaia nti, me ka ndi Israel diri ndu. 21Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n'ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova. 22Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 23Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ. 24N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba. 25Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda. 26Ọṅù uku we di na Jerusalem: n'ihi na site n'ubọchi Solomon nwa Devid, bú eze Israel, ihe dika nka adighi nime Jerusalem. 27Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 30: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye