Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 18

18
1Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n'uba; o we ghọ ọgọ Ehab. 2Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n'uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead. 3Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m'di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n'agha ahu. 4Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova. 5Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n'aka eze. 6Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya? 7Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ ubọchi-ya nile: onye ahu bu Maikaia nwa Imla. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. 8Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ. 9Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha. 10Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 11Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 12Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe. 13Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m'gēkwu. 14O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n'aka-unu. 15Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova? 16Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo. 17Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ? 18Ọ si, N'ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya. 19Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a. 20Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji? 21Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a. 22Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi. 23Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu? 24Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi. 25Eze Israel we si, Kurunu Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze, 26unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gālaghachi n'udo. 27Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile.
28Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead. 29Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n'agha. 30Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya. 31O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua. 32O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ọ bughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi. 33Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam. 34Agha we la elu n'ubọchi ahu: eze Israel we guzogide onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria rue anyasi: ọ we nwua mb͕e anyanwu nāda.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 18: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye