Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 17

17
1Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel. 2O we tiye usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'ala Juda, na n'obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were. 3Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim; 4kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di. 5Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n'aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n'uba. 6Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim. 7Ma n'arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n'obodo Juda nile: 8ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà. 9Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda. 10Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha. 11Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise. 12Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe. 13O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà. 14Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà: 15onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise: 16onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà: 17ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta: 18onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha. 19Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n'obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 17: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye