Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 19

19
1Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua. 2Ma ihe Devid tọrọ Jonatan nwa Sọl utọ nke-uku. Jonatan we gosi Devid, si, Sọl, bú nnam, nāchọ ime ka i nwua: ma ub͕u a, biko, lezie onwe-gi anya n'ututu, nọdu n'ebe di nzuzo, zo onwe-gi: 3ma mu onwem gāpu, guzo n'akuku nnam n'ọhia ebe gi onwe-gi nọ, mu onwem gāgwa kwa nnam okwu bayere gi; ma m'hu ihe ọ bula, m'gēgosi kwa gi. 4Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n'ihi na o mehieghi megide gi, na n'ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n'ebe i nọ: 5n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu? 6Sọl we ge nti olu Jonatan: Sọl we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, agaghi-eme ka ọ nwua ma-ọli. 7Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga.
8Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n'iru ya. 9Mọ ọjọ nke Jehova we di n'aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n'ulo-ya, ube-ya di kwa n'aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ. 10Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n'iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n'abali ahu. 11Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi. 12Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya. 13Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya. 14Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike. 15Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua. 16Ndi-ozi ahu we bata, ma, le, terafim ahu di n'ihe-ndina, ákwà-ob͕ub͕o nke eji aji ewu me di kwa n'okpuru isi-ya. 17Sọl we si Maikal, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom otú a, we zilaga onye-irom, o we wepuga onwe-ya? Maikal we si Sọl, Ya onwe-ya sirim, Zilagam: n'ìhi gini ka m'gēme ka i nwua?
18Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot. 19Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema. 20Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma. 21Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. 22Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema. 23O we je n'ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema. 24Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 19: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye