Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 18

18
1O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. 2Sọl we nara ya n'ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n'ulo nna-ya. 3Jonatan na Devid we b͕a ndu, n'ihi na ọ huru ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. 4Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n'aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n'úkwù-ya. 5Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n'anya ndi Israel nile, di kwa nma n'anya ndi-orù Sọl.
6O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe. 7Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si,
Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,
Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise.
8Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze. 9Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru.
10O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl. 11Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua. 12Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya. 13Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel. 14Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya. 15Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya. 16Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.
17Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya. 18Devid we si Sọl, Ònye ka m'bu, gini bu kwa ndum, ma-ọbu ab͕uru nnam n'Israel, na m'gāburu eze di nwa-ya? 19O rue, na mb͕e agēwere Mirab nwa Sọl nye Devid, na nwayi ahu ka enyere Adriel, bú onye Mehola, na nwunye. 20Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, huru Devid n'anya: ha we gosi Sọl, ihe ahu ziri ezi n'anya-ya. 21Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta. 22Sọl we nye ndi-orù-ya iwu, si, Gwanu Devid okwu na nzuzo, si, Le, ihe-gi nātọ eze utọ, ndi-orù-ya nile hu-kwa-ra gi n'anya: ma ub͕u a buru di nwa eze. 23Ndi-orù Sọl we kwue okwu ndia na nti Devid. Devid we si, Ọ̀ bu ihe di nfe n'anya-unu ibu di nwa eze, ebe mu onwem bu ob͕eye na onye anākpọghi ihe? 24Ndi-orù Sọl we gosi ya, si, Dika okwu ndia si di ka Devid kwuru. 25Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia. 26Ndi-orù-ya we gosi Devid okwu ndia, ma ihe ahu ziri ezi n'anya Devid, bú ka ọ buru di nwa eze. Ma ubọchi nile akēzughi; 27Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n'etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n'ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye. 28Sọl we hu mara kwa na Jehova nọyere Devid; Maikal nwa Sọl hu-kwa-ra ya n'anya. 29Sọl we nātu egwu Devid kari; Sọl we buru onye-iro Devid ubọchi-ya nile.
30Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 18: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye