Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 16

16
1Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom. 2Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo. 3I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te. 4Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? 5Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu. 6O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu. 7Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. 8Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. 9Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. 10Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia. 11Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a. 12Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya. 13Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.
14Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku. 15Ndi-orù Sọl we si ya, Biko, le, mọ ọjọ nke Chineke nēme ka i tua egwu. 16Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n'iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n'aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma. 17Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem. 18Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya. 19Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu. 20Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya. 21Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha. 22Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum. 23O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 16: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara