Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 15

15
1Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova. 2Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota. 3Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.
4Sọl we me ka ndi Israel nuru, o we gukọta ha na Telaim, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise ndi ji ukwu eje, na orú nnù ndikom Juda na nnù ise. 5Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu. 6Sọl we si ndi-Kinait, Jenu, wezuga onwe-unu, si n'etiti ndi Amalek rida, ka m'we ghara ikpochapu unu na ha: n'ihi na unu onwe-unu mere umu Israel nile ebere, mb͕e ha siri n'Ijipt rigota. Ndi-Kinait we si n'etiti Amalek wezuga onwe-ha. 7Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt. 8Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha. 9Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.
10Okwu Jehova we rue Samuel nti, si, 11Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile. 12Samuel we bilie n'isi-ututu izute Sọl n'ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal. 13Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike. 14Samuel we si, Gini bu kwa olu ìgwè aturu na ewu a na ntim, ya na olu ìgwè ehi nke mu onwem nānu? 15Sọl we si, Ọ bu n'etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n'ihi na ndi Israel nwere ọmiko n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya. 16Samuel we si Sọl, Ra aka, m'gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n'abali a. O we si ya, Kwue. 17Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel; 18Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 19N'ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n'anya Jehova? 20Sọl we si Samuel, N'ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m'we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya. 21Ma ndi Israel chiri ufọdu nime ihe-nkwata ichuru Jehova, bú Chineke-gi, àjà, nime Gilgal, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, isi ihe n'ihe ewezugara ka ebibie ya. 22Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu. 23N'ihi na nmehie nke iju-ase n'aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N'ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze. 24Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha. 25Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova. 26Samuel we si Sọl, M'gaghi-esoro gi laghachi: n'ihi na i juwo okwu Jehova, Jehova ajuwo kwa gi ka i ghara ibu eze Israel. 27Samuel we chigharia ila, ma o jidere ọnu-ọnu uwe-nwuda-ya, o we dọwa. 28Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi. 29Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari. 30O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi. 31Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.
32Samuel we si, Menu ka Egag eze Amalek biaruem nso. Egag we biakute ya n'iru-utọ. Egag we si, N'ezi-okwu ilu ọnwu ewezugawo onwe-ya. 33Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal.
34Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl. 35Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n'ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara