Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. PITA 4

4
1Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n'anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n'ihi na onye huworo ahuhu n'anu-aru agharawo nmehie; 2ka unu we ghara ibi ọzọ n'oge fọduru unu n'anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ. 3N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha: 4nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n'omume ahu b͕abà n'otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n'iyì, ha nēkwulu unu: 5ndi gāza ajuju bayere onwe-ha nye Onye ahu Nke doziworo Onwe-ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé. 6N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.
7Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere: 8nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: 9nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu: 10dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche; 11ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
12Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu: 13kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya. 14Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu. 15N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya: 16ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka. 17N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke? 18Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie? 19Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. PITA 4: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara