Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. PITA 3

3
1Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; 2mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. 3Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe; 4kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke. 5N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha: 6dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.
7Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.
8Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala: 9ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi. 10N'ihi na,
Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,
Na ihu ezi ubọchi,
Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,
Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:
11Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;
Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.
12N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,
Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:
Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.
13Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe? 14Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri; 15kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: 16ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya. 17N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ. 18N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya; 19nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n'ulọ-nkpọrọ okwu, 20ndi nēkweyeghi n'oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n'ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya: 21bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist; 22Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. PITA 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara