Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. JỌN 1

1
1Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu, 2(emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n'ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè); 3ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ: 4ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n'akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi.
5Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya. 6Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu: 7ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile. 8Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi. 9Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile. 10Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. JỌN 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye