1
I. JỌN 1:9
Bible Nso
Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa I. JỌN 1:9
2
I. JỌN 1:7
ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.
Nyochaa I. JỌN 1:7
3
I. JỌN 1:8
Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.
Nyochaa I. JỌN 1:8
4
I. JỌN 1:5-6
Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya. Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu
Nyochaa I. JỌN 1:5-6
5
I. JỌN 1:10
Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.
Nyochaa I. JỌN 1:10
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị