Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 80

80
Abụ Ọma 80
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf.
Ekpere maka nnapụta
1Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.
Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,
nwupụta Ìhè 2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.#80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ.
Kpọtee ịdị ike gị,
bịa zọpụta anyị.
3O Chineke, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ
megide ekpere ndị gị?
5I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;
i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,
ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
9Ị sụchaara ya ala,
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
10Ndo ya kpuchiri ugwu niile,
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri
wasaakwa ume ya ruo osimiri.#80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a.
12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile
si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,
ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!
Letakwa osisi vaịnị a,
15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,
ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;
mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,
nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;
tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike zọpụta anyị.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 80: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye