Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 72

72
Abụ Ọma 72
Abụ nke Solomọn.
Ekpere maka eze
1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.
Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;
ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;
ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,
na-esite nʼiyi ukwu.#72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10 ruo na nsọtụ niile nke ụwa#72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ.
9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,
ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
10Ndị eze Tashish#72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21 na mba niile dị nʼebe dị anya,
ga-atụ ụtụ wetara ya;
e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,#72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.
ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,
mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
15Ka ọ dị ogologo ndụ!
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.
A ga-esite na ya gọzie mba niile,
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
Amen na Amen.
20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 72: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye