Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Aịzaya 12

12
Abụ Otuto
1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi.
2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya#12:4 1Ih 16:8; Abụ 105:1;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ#12:4 Abụ 145:4-6.;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ,#12:6 Zef 3:14,15 bụkwaa abụ.
Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel.#12:6 Abụ 89:18 dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”#12:6 Zef 3:17

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Aịzaya 12: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye