Ya mere, ONYENWE ANYị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
Aga m eme ka iro
dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,
nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,
mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,
gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,
“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,
ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.
Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,
ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’
“Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,
site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu
ka ị ga-eri nri gị
tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala
ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị
nʼihi na aja ka ị bụ,
nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”
Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
Emesịa, ONYENWE ANYị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. ONYENWE ANYị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.