Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 3:14-24

JENESIS 3:14-24 Bible Nso (IGBOB)

Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N'ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi: iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu. Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi. Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi; o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi; n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata. Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n'ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu. Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha. Jehova, bú Chineke, we si, Le, madu ahu aghọwo ihe di ka otù onye nime ayi, n'ima ezi ihe na ihe ọjọ; ma ub͕u a, ka o we ghara iseti aka-ya, were nkpuru sitere n'osisi ahu nke ndu, rie, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya. O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n'akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.

JENESIS 3:14-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, ONYENWE ANYị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.” Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile. Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi. Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ. Emesịa, ONYENWE ANYị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. ONYENWE ANYị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.