Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekiliziastis 1

1
Ọ nweghị ihe nwere isi
1Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.
2Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu
ka onye ozizi na-ekwu.
Ihe na-enweghị isi#1:2 Maọbụ, ihe efu Abụ 144:4. ka ihe niile bụ.
Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.
3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile
ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,
ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.
5Anyanwụ na-awa, na-adakwa,
ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.
6Ifufe na-efe gaa na ndịda;
feekwa gburugburu gaa nʼugwu,
ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;
na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.
7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
ma oke osimiri ejughị eju.
Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,
malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.
8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.
Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.
Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.
9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.
10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”?
Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,
nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.
11Anaghị echeta ndị mgbe ochie,
otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa
ndị ga-eso ha
agakwaghị echeta ha.
Amamihe enweghị isi
12Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem. 13Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ? 14Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
15Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.
Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.
16Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.” 17Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
18Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,
oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Ekiliziastis 1: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye