Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Daniel 3:19-27

Daniel 3:19-27 BIU

Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri. Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu. Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.