DANIEL 3:19-27
DANIEL 3:19-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri. Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu. Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
DANIEL 3:19-27 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku. Ọ si-kwa-ra ndi-dike ufọdu bu dìnkpà, ndi di n'usu-ndi-agha-ya, ka ha ke Shedrak na Mishak na Abed-nego ab͕u, tubà ha n'oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. Mb͕e ahu ekere ndikom ndia ab͕u n'uwe-ukwu-ha, na ákwà-nkechi-isi-ha, na uwe-nwuda-ha, na uwe nile ha, ewe tubà ha n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota. Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n'ala n'ab͕u n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n'etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze. Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya. Mb͕e ahu Nebukadneza biaruru nso ọnu-uzọ oké ọku ahu nke nēnwu ajọ onwunwu: ọ kwuru, si, Shedrak na Mishak na Abed-nego, unu ndi-orù nke Chineke Nke kachasi ihe nile elu, putanu, bia. Mb͕e ahu Shedrak na Mishak na Abed-nego siri n'etiti ọku ahu puta. Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n'aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n'aru ha.