Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Ndị Kọrint 16

16
Onyinye nʼihi ndị nsọ nọ na mkpa
1Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu. 2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu. 4Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
Nzube Pọl
5Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa. 6Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ. 7Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye. 8Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ, 9nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.
10Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya. 11Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.
12Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.#16:15 Akaịa bụkwa Griis. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. 17Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a. 18Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ.
Ekele ikpeazụ
19Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele.
Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
20Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu.
Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
21Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a.
22Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa!
23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
24Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

1 Ndị Kọrint 16: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara