1
ABÙ ỌMA 139:14
Bible Nso
M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:14
2
ABÙ ỌMA 139:23-24
Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile: Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem, Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:23-24
3
ABÙ ỌMA 139:13
N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:13
4
ABÙ ỌMA 139:16
Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:16
5
ABÙ ỌMA 139:1
Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:1
6
ABÙ ỌMA 139:7
Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:7
7
ABÙ ỌMA 139:2
Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:2
8
ABÙ ỌMA 139:4
N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:4
9
ABÙ ỌMA 139:3
Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.
Nyochaa ABÙ ỌMA 139:3
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị