Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI KỌLỌSI 3:1

Ịhụnanya na Alụmdi-Na-Nwunye
Ụbọchị Ise
Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e derè n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nà-enye Chineke ohere ikpughè nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a nà-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta-ụka na ekpere gị na onye i lụrụ̀ gà n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ̀ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu ná mmekọrịta gị dị́ ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church

OKU A NA-AKPỌ ANYỊ Ị LEKWASỊ ANYA N'IHE KACHA MKPA
5 Ụbọchị
Nke a bụ oku nye ndị niile kwere ekwe ka ha lekwasị anya na njirimara ọhụrụ bụ nke ha n'ime Kraịst, ma na-echetara ha na a kpọlitewo ha na Kraịst. Ya bụ ihe mere na ha ga eitinye uche ha n'ihe ndị dị n'elu, ọ bụghịkwa n'ihe ndị dị n'ụwa. Atụmatụ ọgụgụ ụbọchị ise a na-arụ ọrụ dị ka oku nye ndị kwere ekwe ka ha bie ndụ okwukwe ha n'ụzọ bara uru, ma na-achọ igosipụta àgwà nke Kraịst n'akụkụ ọ bụla nke ndụ ha.