Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara II. NDI KỌRINT 4:17
Ịru Újú
Ụbọchị Ise
Ịru újú nwere ike ịdị gị ka ihe ị n'enweghị ike idì. Ọ bụ ezie na n'agbanyeghị na ndị enyi na ezinụlọ ji obi ha niile na-enye nkwado na agbamume, ọ na ka-adị anyị ka ọ dịghị onye ghọtara ihe anyị na-agabiga n’ezie—na anyị nọ nanị anyị n'ime nhụjuanya anyị. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ị ga-ezute akụkụ Akwụkwọ Nsọ gasị na-akasi obi ga-enyere gị aka iji anya ọzọ hụ ịru újú gị otu Chineke si chọọ ka ị lekwasị ya anya, nwee mmetụta dị ukwuu nke oké ịhụnanya na echiche dị mma Onye Nzọpụta anyị nwere maka gị, na nweta enyemaka maka ihe mgbu gị.
Nkwa Ahụ
Ubọchị 6
N'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ndi Life.Church a, di na nwunye isii na -ede maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha na -ekwughi n'ihu ọha ebe ịchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, mmekọ, ịdị ọcha na ekpere bụ nkwa na -eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na -eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ
Mmeri gafee Ọnwụ
Ubọchị 7
A na-agwa anyị mgbe niile, "Ọ bụ ihe ọzọ di n'ibi ndụ," mana okwu ndi di otu ahu adịghị eme ka ihe mgbu di na mmadụ inwụnahụrụ ndi nke ya di obere mwụte. Mụta ịgbakwụte Chineke mgbe ị na-agabiga otu n’ime ihe kasị sie ike ná ndụ.
Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi Abụọ
Ụbọchị Iri
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.