YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 49

49
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma Umu Kora.
1Nurunu nka, ndi nile di iche iche;
Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:
2Ma ndi di ala ma ndi di elu,
Ọgaranya na ob͕eye n'otù.
3Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile;
Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.
4M'gātọ ntim n'ala n'ilu:
M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.
5N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ,
Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,
6Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha,
Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?
7Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli,
Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:
8(N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia,
Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)
9Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi,
Ghara ihu nbibi anya.
10N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu,
N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì,
We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.
11Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi,
Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile;
Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.
12Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru:
O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.
13Uzọ-ha nka buru ha nzuzu:
Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah
14Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye;
Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu:
Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu;
Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.
15Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ:
N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah
16Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya,
Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:
17N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la;
Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.
18N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya,
Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.
19Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà;
Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.
20Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe,
Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 49: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in