YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 48

48
Abù; Abù Ọma umu Kora.
1Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku,
N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.
2Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile,
Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu,
Bú obodo Eze ukwu.
3Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.
4N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,
Ha gabigara n'otù.
5Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;
Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.
6Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu;
Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.
7I ji ifufe Iru-anyanwu
Tiwa ub͕ọ nile nke Tashish.
8Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworo
N'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi:
Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah
9Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke,
N'etiti ulo uku Gi.
10Dika aha-Gi si di, Chineke,
Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa:
Ezi omume juputara aka-nri-Gi.
11Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu,
Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù,
N'ihi ikpé-Gi nile.
12Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu:
Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.
13Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya,
Tulenu ulo nile ya di elu;
Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.
14N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi;
Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 48: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in