YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 50

50
Abù Ọma Esaf.
1Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,
We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,
Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:
Ọku nēripia n'iru Ya,
Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù,
Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5Chikọtaranum ndi-eberem;
Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;
N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7Nuru, ndim, M'gēkwu kwa;
Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi:
Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.
8Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba;
Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,
M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,
Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:
Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:
N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13M'gēri anu oke-ehi?
Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14Chuara Chineke ekele dika àjà;
Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:
15Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;
M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,
Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?
Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,
We tufue okwum nile n'azu gi.
18Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,
Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
19I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,
Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.
20I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;
Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.
21Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;
I chère na adizum ka i di:
M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.
22Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,
Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:
23Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum;
Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya
Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 50: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in