YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 116

116
1Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānu
Olum, bú aririọ-amaram nile.
2N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ,
Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya.
3Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,
Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram:
Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.
4M'we kpọkue aha Jehova;
Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.
5Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu;
E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.
6Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu:
Enweghm ike, O we nyem nzọputa.
7Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;
N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.
8N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,
I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,
I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.
9M'gējeghari n'iru Jehova
N'ala nile nke ndi di ndu.
10Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu:
Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:
11Mu onwem siri na nkujam
Madu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.
12M'gēsi aṅa nyeghachi Jehova
Nmeso ọma Ya nile O mesoworom?
13Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli,
Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.
14Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,
Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.
15Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova
Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.
16Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi:
Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi;
I tọpuwo ab͕um nile.
17Gi ka m'gāchuru aja ekele,
Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.
18Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,
Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;
19N'ogige nile nke ulo Jehova,
N'etiti gi, Jerusalem.
Tonu Ja.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 116: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in