YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 115

115
1Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi,
Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru,
N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.
2N'ìhi gini ka mba nile nāsi,
Biko, òle ebe Chineke-ha nọ?
3Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe:
Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.
4Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo,
Ọlu aka madu.
5Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu;
Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;
6Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe;
Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;
7Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;
Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;
Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.
8Ndi nēme ha gādi ka ha:
E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.
9Israel, tukwasi Jehova obi:
Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
10Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:
Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
11Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi:
Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.
12Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi:
Ọ gāgọzi ulo Israel;
Ọ gāgọzi ulo Eron.
13Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova,
Ma ndi ntà ma ndi uku.
14Ka Jehova tukwasiri unu madu,
Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.
15Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu,
Onye meworo elu-igwe na uwa.
16Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere;
Ma uwa ka O nyeworo umu madu.
17Ndi nwuru anwu adighi-eto Ja,
Ndi nile kwa ndi nārida n'ebe inọ-dū, ha adighi-eto Ya;
18Ma ayi onwe-ayi gāgọzi Ja
Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
Tonu Ja.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 115: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in