YouVersion Logo
Search Icon

ILU 29

29
1Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,
N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
2Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:
Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.
3Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:
Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.
4Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:
Ma onye nānara onyinye nākwada ya.
5Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ
Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.
6Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:
Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.
7Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:
Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.
8Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:
Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.
9Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,
Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.
10Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:
Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.
11Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:
Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.
12Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,
Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.
13Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:
Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.
14Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,
Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
15Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:
Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.
16Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:
Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.
17Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;
E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.
18Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:
Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.
19Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:
N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.
20Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?
Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
21Onye zutọworo orù-ya site na nwata,
N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.
22Onye-iwe nākpali ise-okwu,
Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.
23Npako madu gēme ka ọ di ala:
Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.
24Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì:
Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.
25Egwu madu nēweta ọnyà:
Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.
26Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi:
Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.
27Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu:
Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.

Currently Selected:

ILU 29: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in